25 Ha jidekwara ndị isi abụọ nke Midian, ya bụ, Oreb na Zieb;+ ha wee gbuo Oreb n’elu oké nkume Oreb,+ ha gbukwara Zieb n’olulu nzọchapụta mmanya nke Zieb. Ha wee chụrụ ndị Midian+ na-aga, ha wee butere Gidiọn isi Oreb na isi Zieb n’ógbè Jọdan.+
21 Ziba na Zalmọna wee sị: “Bilie n’onwe gị gbuo anyị, n’ihi na otú nwoke hà ka ike ya+ hà.” Gidiọn wee bilie gbuo+ Ziba na Zalmọna, werekwa ihe ịchọ mma yiri ọnwa nke dị n’olu kamel ha.