Abụ Ọma 9:11 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 11 Bụkuonụ Jehova, bụ́ onye bi na Zayọn,+ abụ olu ụtọ;Kọsaanụ ọrụ ya n’etiti ndị dị iche iche.+ Abụ Ọma 40:5 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 5 I mewo ọtụtụ ihe,+Jehova bụ́ Chineke m, bụ́ ọrụ gị ndị dị ebube nakwa ihe ndị ị na-eche banyere anyị;+Ọ dịghị onye a ga-eji tụnyere gị.+Ọ bụrụ na mụ asị ka m kọwa ha ma ọ bụ kwuwe banyere ha,Ha dị ọtụtụ karịa otú m pụrụ ịkọ.+ Abụ Ọma 105:2 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 2 Bụkuonụ ya abụ, bụkuonụ ya abụ olu ụtọ,+Chebaranụ ọrụ ya niile dị ebube echiche.+ Abụ Ọma 145:4 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 4 Ọgbọ niile ga-aja ọrụ gị mma,+Ha ga-akọkwa akụkọ banyere oké ọrụ gị.+
5 I mewo ọtụtụ ihe,+Jehova bụ́ Chineke m, bụ́ ọrụ gị ndị dị ebube nakwa ihe ndị ị na-eche banyere anyị;+Ọ dịghị onye a ga-eji tụnyere gị.+Ọ bụrụ na mụ asị ka m kọwa ha ma ọ bụ kwuwe banyere ha,Ha dị ọtụtụ karịa otú m pụrụ ịkọ.+