3 N’ihi na otu mba esiwo n’ebe ugwu bịa buso ya agha.+ Ọ bụ mba ahụ mere ka ala ya bụrụ ihe ijuanya, nke mere na ọ dịghị onye bi n’ime ya.+ Ma mmadụ ma anụ ụlọ agbalagawo.+ Ha agbafuola.”+
11 Pịanụ akụ́ unu.+ Burunụ ọta okirikiri unu. Jehova akpaliwo mmụọ nke ndị eze ndị Midia,+ n’ihi na o bu n’obi imegide Babịlọn,+ iji laa ya n’iyi. N’ihi na ọ bụ ịbọ ọbọ Jehova, bụ́ ọbọ ọ ga-abọ n’ihi ụlọ nsọ ya.+