6 Ọ bụ ya mere ọbụbụ ọnụ ji ripịa ala a,+ ikpe amawokwa ndị bi na ya. Ọ bụ ya mere ndị bi na ya ji belata n’ọnụ ọgụgụ, ọ bụkwa mmadụ ole na ole fọdụrụ.+
2 O wee jiri oké olu tie mkpu,+ sị: “Ọ dawo! Babịlọn Ukwu ahụ adawo,+ ọ ghọwokwa ebe obibi nke ndị mmụọ ọjọọ na ebe zoro ezo nke ume ọ bụla e kupụrụ ekupụ+ nke na-adịghị ọcha na ebe zoro ezo nke anụ ufe niile na-adịghị ọcha, nke a kpọkwara asị!+