12 “‘Ọ ga-erukwa na mgbe afọ iri asaa gasịrị,+ m ga-eme ka eze Babịlọn na mba ahụ,+ ya bụ, ala ndị Kaldia, zaa ajụjụ maka njehie ha,’+ ka Jehova kwuru, ‘m ga-emekwa ka ọ bụrụ ebe tọgbọrọ n’efu ruo mgbe ebighị ebi.+
15 Nọrọnụ n’akụkụ niile tie mkpu agha megide ya.+ Ọ chịliwo aka elu.+ Ogidi ya niile adawo. A kwatuwo mgbidi ya niile.+ N’ihi na ọ bụ ịbọ ọbọ Jehova.+ Bọọnụ ọbọ n’ahụ́ ya. Meenụ ya ihe o mere ndị ọzọ.+