14 Nke a bụ ihe Jehova, Onye Mgbapụta unu,+ bụ́ Onye Nsọ Izrel,+ kwuru: “Ọ bụ n’ihi unu ka m ga-eziga ha na Babịlọn ma mee ka ihe e ji tụchie ụlọ mkpọrọ dapụsịa,+ kwatuokwa ndị Kaldia nọ n’ụgbọ mmiri, ha ewee na-eti mkpu ákwá.+
25 “Jehova emeghewo ụlọ nkwakọba ihe ya, ọ na-ewepụtakwa ngwá agha amamikpe ya.+ N’ihi na ọ dị ọrụ Ọkaakaa+ Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, ga-arụ n’ala ndị Kaldia.+
56 N’ihi na onye na-ebukọrọ ihe mmadụ ga-abịakwasị Babịlọn,+ a ga-ejidekwa ndị dike ya.+ A ga-agbajisị ụta ha,+ n’ihi na Jehova bụ Chineke nke na-akwụ ụgwọ.+ Ọ ghaghị ịkwụ ya ụgwọ.+