5 Obi m na-akwara Moab ákwá.+ Ndị si n’ime ya gbapụ eruwo ọbụna Zoa+ na Eglat-shelaịshiya.+ N’ihi na n’ụzọ gbagoro Luhit+—onye ọ bụla ji ákwá na-agbago; n’ihi na ha nọ n’ụzọ Họroneyim+ na-akpasu iti mkpu ákwá banyere oké ọdachi ahụ.
36 ‘Ọ bụ ya mere obi m ga-eji na-eme mkpọtụ dị ka ọjà n’ihi Moab;+ obi m ga na-adakwa ka ọjà n’ihi ndị Kia-hires.+ Ọ bụ ya mere ihe hiri nne o mepụtara ga-eji laa n’iyi.+