Aịzaya
15 Okwu e kwuru megide Moab:+ N’ihi na e bukọrọwo ihe ya n’abalị, a lawo Aa+ nke Moab n’iyi. N’ihi na e bukọrọwo ihe ya n’abalị, a lawo Kia+ nke Moab n’iyi. 2 Ọ gbagowo n’Ụlọ Nsọ nakwa na Daịbọn,+ n’ebe ndị dị elu, ịkwa ákwá. Moab na-eti mkpu ákwá n’ihi Nibo+ nakwa n’ihi Medeba.+ Isi ndị niile nọ n’ime ya kwọchara akwọcha;+ a kpụrụ ajị agba ọ bụla akpụ. 3 Ha kere ákwà iru uju+ n’úkwù nọrọ n’okporo ámá ndị dị n’ime ya. Onye ọ bụla nke nọ n’ime ya na-eti mkpu ákwá n’elu ụlọ+ ndị dị n’ime ya nakwa n’ámá obodo ya, kwara ákwá na-agbada.+ 4 Heshbọn na Iliele+ na-eti mkpu ákwá. A na-anụ olu ha na Jehaz.+ Ọ bụ ya mere ndị agha Moab ji na-eti mkpu. Mkpụrụ obi ya amawo jijiji n’ime ya.
5 Obi m na-akwara Moab ákwá.+ Ndị si n’ime ya gbapụ eruwo ọbụna Zoa+ na Eglat-shelaịshiya.+ N’ihi na n’ụzọ gbagoro Luhit+—onye ọ bụla ji ákwá na-agbago; n’ihi na ha nọ n’ụzọ Họroneyim+ na-akpasu iti mkpu ákwá banyere oké ọdachi ahụ. 6 N’ihi na mmiri Nimrim+ ga-atakọ. N’ihi na ahịhịa ndụ akpọnwụwo, ahịhịa adịkwaghị. Ọ dịghịzi ihe na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ.+ 7 Ọ bụ ya mere ha ji na-eburu ihe fọdụrụ afọdụ na ihe ha kwakọbara na-agafere ndagwurugwu osisi pọpla. 8 N’ihi na mkpu ákwá ha eruwo ala Moab dum.+ Mkpu ákwá a na-eti n’ime ya eruwo Egleyim; mkpu ákwá a na-eti n’ime ya eruwo Bia-ilim, 9 n’ihi na mmiri nke Daịmọn ejupụtawo n’ọbara. N’ihi na m ga-eme ka ihe ndị ọzọ bịakwasị Daịmọn. Dị ka ihe atụ, ọdụm ga-awakpo ndị Moab gbapụrụ agbapụ na ndị fọdụrụ n’ala ahụ.+