Aịzaya
16 Sinụ na Sila nke dị n’ụzọ ala ịkpa zigara onye na-achị ala a ebule,+ ziga ya n’ugwu nke ada bụ́ Zayọn.+
2 Ọ ga-erukwa na, dị ka anụ ufe nke na-efepụ efepụ, nke a chụpụrụ n’akwụ́ ya,+ otú a ka ụmụ Moab ga-adị n’ebe ndị a na-eji ụkwụ agafe mmiri Anọn.+
3 “Nyenụ ndụmọdụ, meenụ ihe e kpere n’ikpe.+
“Mee ka ndò gị dị ka abalị n’etiti ehihie.+ Zobe ndị a chụsara achụsa.+ Ararala onye ọ bụla nke na-agbapụ agbapụ nye.+ 4 Ka ndị m a chụsara achụsa biri dị ka ndị ọbịa n’ime gị, gị Moab.+ Ghọọrọ ha ebe ha ga-ezo iji gbanahụ onye na-ebukọrọ ihe.+ N’ihi na onye mmegbu alawo n’iyi; ibukọrọ ihe mmadụ akwụsịwo; e kpochapụwo ndị na-azọda ndị ọzọ n’ụwa.+
5 “Obiọma* ga-eme ka ocheeze guzosie ike.+ Otu onye ga-anọdụkwa na ya n’izi ezi n’ụlọikwuu Devid,+ na-ekpe ikpe, na-achọ ikpe ziri ezi, dịkwa ngwa n’ime ezi omume.”+
6 Anyị anụwo banyere nganga Moab, na ọ dị nganga nke ukwuu;+ mpako ya na nganga ya na oké iwe ya+—ọnụ ọ na-etu agaghị emezu.+ 7 Ya mere, ndị Moab ga-etiri Moab mkpu ákwá; ọbụna ha niile ga-eti mkpu ákwá.+ Ndị e tiri ihe ga-akwa ákwá maka mkpụrụ vaịn a mịrị amị nke Kia-hareset,+ 8 n’ihi na mbara ala Heshbọn+ akpọwo nkụ. Osisi vaịn nke Sibma+—ndị nwe mba dị iche iche egbujiwo alaka ya ndị na-acha nnọọ ọbara ọbara. Ha wasara ruo Jeza;+ ha wasara n’ala ịkpa. A hapụrụ alaka ya ka ha wasaara onwe ha; ha eruwo n’oké osimiri.
9 Ọ bụ ya mere m ga-eji kwaara osisi vaịn nke Sibma+ ákwá otú m na-akwara Jeza. M ga-eji anya mmiri m dee unu, Heshbọn+ na Iliele,+ n’ihi na e tiwo mkpu n’ọkọchị gị nakwa n’oge owuwe ihe ubi gị.+ 10 E mewo ka obi ụtọ na ịṅụrị ọṅụ kwụsị n’ubi mkpụrụ osisi. Ọ dịghị iti mkpu ọṅụ dị n’ubi vaịn, ọ dịghịkwa mkpu a na-eti.+ Ọ dịghị mmanya onye na-azọcha mkpụrụ vaịn na-azọchapụta.+ Emewo m ka iti mkpu kwụsị.+
11 Ọ bụ ya mere ime afọ m ji na-eme mkpọtụ dị ka ụbọ akwara n’ihi Moab,+ ime ahụ́ m na-emekwa mkpọtụ n’ihi Kia-hareset.+
12 E wee hụ na e mere ka ike gwụ Moab n’ebe dị elu;+ o wee bịa ikpe ekpere n’ebe nsọ ya,+ o melighịkwa ihe ọ bụla.+
13 Nke a bụ ihe Jehova kwuru na mbụ banyere Moab. 14 Jehova ekwuwokwa ugbu a, sị: “Tupu afọ atọ agafee, dị ka afọ nke onye ọrụ e goro ego si dị,+ a ga-eji ụdị oké ọgba aghara ọ bụla weda ebube+ Moab ala, ndị fọdụrụnụ ga-abụkwa mmadụ ole na ole, ndị na-adịghị ike.”+