Aịzaya
17 Okwu e kwuru megide Damaskọs:+ “Lee! E mewo ka Damaskọs ghara ịbụkwa obodo. Ọ ghọwokwa ikpo ihe, mkpọmkpọ ebe nke na-adakpọ adakpọ.+ 2 Obodo niile dị n’Aroa,+ bụ́ ndị a hapụrụ ahapụ, aghọwo ebe ìgwè anụ na-anọ, ebe ha na-amakpu, ọ dịghịkwa onye na-eme ka ha maa jijiji.+ 3 E mewo ka a ghara inwekwa obodo e wusiri ike n’Ifrem,+ kpochapụkwa alaeze n’ime Damaskọs.+ Ndị Siria fọdụrụ afọdụ ga-adị nnọọ ka ebube nke ụmụ Izrel,” ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.+
4 “Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ na a ga-eweda ebube Jekọb ala,+ a ga-emekwa ka ọ taa ahụ́.+ 5 Ọ ga-erukwa na mgbe onye na-ewe ihe ubi ga na-achịkọta ọka* kwụ ọtọ, mgbe o jikwa aka ya na-ewekọta oko ọka,+ ọ ga-adị ka onye na-atụtụkọta oko ọka e wefọrọ n’ubi na ndagwurugwu Refeyim.+ 6 Ihe e wefọrọ n’ubi ga-afọdụkwa n’ime ya dị ka mgbe a kụtusịrị mkpụrụ dị n’osisi oliv: mkpụrụ oliv abụọ ma ọ bụ atọ chara acha afọdụ n’elu alaka ya; mkpụrụ anọ ma ọ bụ ise afọdụ n’alaka ya nke na-amị mkpụrụ,” ka Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru.+
7 N’ụbọchị ahụ, olileanya mmadụ ga-adị n’ebe Onye kere ya nọ, anya ya ga-elekwasịkwa Onye Nsọ Izrel.+ 8 Ọ gaghịkwa elekwasị ebe ịchụàjà anya,+ bụ́ ọrụ aka ya;+ ọ gaghịkwa elegide ihe mkpịsị aka ya mere anya, n’elu ogwe osisi dị nsọ ma ọ bụ n’ihe e ji adọba ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ.+ 9 N’ụbọchị ahụ, obodo ya ndị e wusiri ike ga-adị ka ebe a hapụrụ kpamkpam n’oké ọhịa, bụ́ alaka nke ha hapụrụ kpamkpam n’ihi ụmụ Izrel. Ọ ga-aghọkwa ebe tọgbọrọ n’efu.+ 10 N’ihi na i chefuola+ Chineke nke nzọpụta gị;+ i chetaghịkwa Oké Nkume+ nke bụ́ ebe gị e wusiri ike. Ọ bụ ya mere i ji kụọ osisi mara mma n’ubi, kụọkwa okporo osisi ndị mba ọzọ na ya. 11 N’ehihie, i nwere ike ịgba ubi gị ogige nke ọma, i nwekwara ike ime ka mkpụrụ ị kụrụ puo n’ụtụtụ, ma a gaghị enwe ihe ubi n’ụbọchị ọrịa nakwa n’ụbọchị ihe mgbu nke na-enweghị ngwọta.+
12 Ewoo, ọgba aghara nke ọtụtụ ndị, bụ́ ndị na-agba aghara dị ka mmali nke oké osimiri! Nakwa mkpọtụ nke mba dị iche iche, bụ́ ndị na-eme mkpọtụ dị ka ụzụ nke oké mmiri!+ 13 Mba dị iche iche+ ga-eme mkpọtụ dị ka mkpọtụ nke ọtụtụ mmiri. Ọ ga-abara ha mba,+ ha ga-agbagakwa n’ebe dị anya. A ga-achụkwa ha ọsọ dị ka igbogbo ọka dị n’ugwu nke ifufe na-ebugharị, dịkwa ka ogwu nke ifufe bu agba gburugburu mgbe ifufe na-efe.+ 14 Lee! a ga-enwe ụjọ mberede mgbe chi jiri. Tupu chi abọọ—ọ gaghị adịkwa.+ Nke a bụ òkè nke ndị na-akwakọrọ ihe anyị, bụrụkwa òkè nke ndị na-ebukọrọ ihe anyị.+