13 Ha ghara ọka wit, ma, ọ bụ ogwu ka ha ghọtara.+ Ha arụtaworo onwe ha ọrịa; ọ gaghị abara ha uru.+ Ihere ihe ha rụpụtara ga-eme ha n’ihi iwe dị ọkụ nke Jehova.”
7 “N’ihi na ọ bụ ifufe ka ha na-agha dị ka mkpụrụ, ọ bụkwa oké ifufe mmiri ka ha ga-aghọrọ.+ Ọ dịghị ebe e nwere ọka* kwụ ọtọ.+ Ọ dịghị ome nke mepụtara ntụ ọka.+ Ọ bụrụ na e nwee nke mepụtara ihe, ndị ala ọzọ ga-eloda ya.+
13 A ga-akwakọrọ akụ̀ ha, meekwa ka ụlọ ha tọgbọrọ n’efu.+ Ha ga-ewu ụlọ ma ha agaghị ebi n’ime ha;+ ha ga-akọkwa ubi vaịn ma ha agaghị aṅụ mmanya ya.+