25 “Ọ bụrụ na ị banye n’ọka* kwụ ọtọ nke mmadụ ibe gị, jiri aka ghọrọ naanị oko ọka ndị chara acha, kama emetụla mma owuwe ihe ubi n’ọka kwụ ọtọ nke mmadụ ibe gị.+
22 “Kwuo, sị, ‘Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Ozu ndị mmadụ ga-adị ka nsị anụ n’elu ala, dịkwa ka ùkwù ọka* onye na-ewe ihe ubi ka gbutusịrị egbutusị n’enweghị onye ga-achịkọta ha.”’”+
13 “Tinyenụ mma owuwe ihe ubi,+ n’ihi na ihe ubi achawo.+ Bịanụ, gbadatanụ, n’ihi na ebe nzọchapụta mmanya ejuwo.+ Olulu ịzọchapụta mmanya ejubigawo ókè; n’ihi na ihe ọjọọ ha adịwo ukwuu.+