24 Ya onwe ya kwa yipụrụ uwe ya ma na-eme dị ka onye amụma n’ihu Samuel, ee, ya onwe ya, ọ gbakwa ọtọ dinara ala n’ehihie ahụ dum nakwa n’abalị ahụ dum.+ Ọ bụ ya mere ha ji asị: “Sọl ò sokwu ná ndị amụma?”+
8 N’ihi nke a, m ga-akwa ákwá arịrị, tiekwa mkpu ákwá;+ m ga-agba ụkwụ efu, gbarakwa ọtọ na-ejegharị.+ M ga na-eti mkpu dị ka nkịta ọhịa, na-erukwa uju dị ka nne enyí nnụnụ.
37 A tụrụ ha nkume,+ a nwara ha ọnwụnwa,+ a kwọbiri ha akwọbi, e ji mma agha gbuo ha,+ ha yi akpụkpọ atụrụ+ na akpụkpọ ewu na-agagharị, ka ha nọ n’ụkọ,+ ná mkpagbu,+ ka a na-emeso ha mmeso ọjọọ;+