33 N’ihi na e doworị Tofet+ ya n’usoro n’oge na-adịbeghị anya; a kwadebewokwara ya eze.+ Ọ kwakọtawo nkụ ya n’ebe miri emi. E nwere ọkụ na nkụ dị ukwuu. Ume Jehova na-ere ka ọkụ megide ya, dị ka sọlfọ nke na-asọ ka mmiri.+
6 “‘“Ya mere, lee! oge na-abịa,” ka Jehova kwuru, “mgbe a na-agakwaghị akpọ ebe a Tofet+ nakwa ndagwurugwu nwa Hinọm,+ kama, a ga na-akpọ ya ndagwurugwu igbu mmadụ.