13 Gaanụ jụọ Jehova ase+ n’aha m nakwa n’aha ndị ala anyị nakwa n’aha Juda dum banyere ihe e kwuru n’akwụkwọ a a hụrụ; n’ihi na ọnụma Jehova+ nke e mere ka o nwuru ọkụ n’ebe anyị nọ dị ukwuu n’ihi na nna nna anyị hà+ egeghị ntị n’ihe e kwuru n’akwụkwọ a site n’ime ihe niile e dere banyere anyị.”+