27 Lee! Aha Jehova si n’ebe dị anya na-abịa, n’iwe ya na-ere ọkụ+ nakwa n’oké ígwé ojii. Egbugbere ọnụ ya jupụtara n’amamikpe, ire ya dịkwa ka ọkụ na-erepịa ihe.+
14 Ya mere, nke a bụ ihe Jehova, bụ́ Chineke nke ụsụụ ndị agha, kwuru: “Ebe ọ bụ na unu na-ekwu ihe a, lee, m ga-eme ka okwu m nke dị n’ọnụ gị bụrụ ọkụ,+ ndị a ga-abụkwa nkụ, ọ ga-erepịakwa ha.”+
9 M wee sị: “Agaghị m ekwu okwu banyere ya, agakwaghị m ekwu okwu n’aha ya.”+ Ma n’ime obi m, ọ dị ka ọkụ na-ere ere nke e mechibidoro ụzọ n’ime ọkpụkpụ m; ike wee gwụ m ịgbachi nkịtị, enweghịkwa m ike idi ya.+