49Nke a bụ ihe Jehova kwuru banyere ụmụ Amọn:+ “Ọ̀ bụ na Izrel enweghị ụmụ, ka ọ̀ bụ na Izrel enweghị onye ga-eketa ihe ya? Gịnị mere Malkam+ ji weghara Gad,+ gịnịkwa mere ndị na-efe ya ji biri n’obodo ndị dị n’Izrel?”+
13 “Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘“N’ihi nnupụisi atọ nke ụmụ Amọn nupụrụ+ nakwa n’ihi nnupụisi anọ o nupụrụ, m gaghị eme ka ọ laghachi azụ,+ n’ihi na ha bọwara ndị inyom Gilied dị ime afọ, iji mee ka ókèala ha saa mbara.+