13 Jehova wee na-adọ Izrel+ na Juda+ aka ná ntị+ site n’ọnụ ndị amụma+ ya niile na ndị ọhụụ+ niile, sị: “Hapụnụ ụzọ ọjọọ+ unu ma debe ihe m nyere n’iwu+ na ụkpụrụ+ m, dị ka iwu+ dum m nyere nna nna unu hà+ si dị, nke m ziteere unu site n’ọnụ ndị ohu m bụ́ ndị amụma”;+
13 Ebe ọ bụ na unu nọ na-eme ihe ndị a,’ ka Jehova kwuru, ‘mụ onwe m wee na-agwa unu okwu, na-ebili n’isi ụtụtụ na-agwa unu okwu,+ ma unu egeghị ntị,+ m nọkwa na-akpọ unu òkù, ma unu azaghị,+
7 N’ihi na m dụsiri nna nna unu hà ọdụ ike n’ụbọchị m si n’ala Ijipt+ kpọpụta ha ọbụna ruo taa, na-ebili n’isi ụtụtụ na-adụ ha ọdụ, sị: “Rubenụ isi n’ihe m kwuru.”+
3 “Malite n’afọ nke iri na atọ nke ọchịchị Josaya+ nwa Emọn, bụ́ eze Juda, ruo taa, afọ iri abụọ na atọ a, okwu Jehova anọwo na-eru m ntị, m wee na-agwa unu okwu, na-ebili n’isi ụtụtụ na-ekwu okwu, ma unu egeghị ntị.+