13 O wee si n’ebe ahụ wepụta akụ̀ niile dị n’ụlọ Jehova na akụ̀ ndị dị n’ụlọ eze,+ o wee gburisịa arịa ọlaedo niile+ Sọlọmọn eze Izrel mere n’ụlọ nsọ Jehova, dị nnọọ ka Jehova kwuru.
2 Ka oge na-aga, Jehova nyefere Jehoyakim eze Juda+ na ụfọdụ n’ime arịa+ ndị dị n’ụlọ ezi Chineke n’aka ya, o wee bute ha n’ala Shaịna,+ n’ụlọ chi ya; o wee busa arịa ndị ahụ n’ụlọ a na-edebe akụ̀ nke chi ya.+