20 “N’ụbọchị ndị ahụ nakwa n’oge ahụ,”+ ka Jehova kwuru, “a ga-achọ njehie Izrel,+ ma ọ gaghị adị; a ga-achọkwa mmehie Juda,+ ma a gaghị ahụ ya, n’ihi na m ga-agbaghara ndị m hapụrụ ka ha fọdụ.”+
18 Olee Chi dị ka gị,+ onye na-agbaghara njehie, nke na-agbaghakwara mmebi iwu+ nke ndị fọdụrụ n’ihe nketa ya?+ Ọ gaghị na-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi, n’ihi na obiọma* na-atọ ya ụtọ.+
15 Ọ bụ ya mere o ji bụrụ onye ogbugbo+ nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, ka ndị a kpọrọ wee nata nkwa nke ihe nketa ebighị ebi,+ n’ihi na ọ nwụrụ ka e wee site n’ihe mgbapụta+ tọhapụ ha ná mmebi iwu ndị ha mere mgbe ha nọ n’ọgbụgba ndụ ahụ gara aga.+