27 Mgbe a na-arara mgbidi Jeruselem nye,+ ha chọrọ ndị Livaị, ime ka ha si n’ebe niile ha nọ bịa Jeruselem ime ememme nraranye na iji ọṅụ na-enye ekele,+ na iji ájà, ụbọ akwara+ na une+ na-abụ abụ.+
28 Onye na-ekwu banyere Saịrọs,+ sị, ‘Ọ bụ onye ọzụzụ atụrụ m, ọ ga-eme ihe niile na-atọ m ụtọ;+ ọ ga-eme ọbụna ihe m kwuru banyere Jeruselem, sị, ‘A ga-ewughachi ya,’ na ihe m kwuru banyere ụlọ nsọ ya, sị, ‘A ga-atọ ntọala gị.’”+
18 Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Lee, m ga-achịkọta ndị e si n’ụlọikwuu Jekọb dọrọ n’agha,+ m ga-enwere ụlọikwuu ya dị nsọ ọmịiko. A ga-ewughachi obodo ya ná mkputamkpu ala ya;+ ụlọ elu ya ga-adịkwa n’ebe o kwesịrị ịdị.+