15 Ma, ya doo unu anya na ọ bụrụ na unu egbuo m, ọ bụ ọbara na-emeghị ihe ọjọọ ka unu na-eme ka ọ dịrị n’isi unu nakwa n’isi obodo a nakwa n’isi ndị bi na ya,+ n’ihi na n’eziokwu, ọ bụ Jehova ziri m ka m bịakwute unu kwuo ihe a niile ná ntị unu.”+
9 “Onyenwe m eze, ọ bụ ihe ọjọọ ka ndị a mere n’ihe niile ha mere Jeremaya onye amụma, bụ́ onye ha tụbara n’olulu, ka ụnwụ+ wee gbuo ya n’ebe ahụ ọ nọ.+ N’ihi na nri adịkwaghị n’obodo a.”