26 Ada bụ́ ndị m, kee ákwà iru uju n’úkwù,+ tụrụọkwa onwe gị ná ntụ.+ Ruo uju dị ka nke a na-eruru nwa a mụrụ naanị ya ma ọ nwụọ, bụ́ mkpu arịrị e ji obi ilu na-eti;+ n’ihi na onye na-ebukọrọ ihe mmadụ ga-abịakwasị anyị na mberede.+
20 E bibiwo ụlọikwuu m, e gbubiwokwa ụdọ ụlọikwuu m niile.+ Ụmụ m esiwo n’ebe m nọ pụọ, ha anọkwaghị.+ Ọ dịkwaghị onye na-agbasa ụlọikwuu m, ọ dịkwaghị onye na-eweli ákwà ụlọikwuu m elu.