6 Jehova nwere mma agha. Ọ ga-ejupụta n’ọbara.+ A ga-eme ka o jupụta n’abụba, jupụtakwa n’ọbara ụmụ ebule na mkpi, na abụba+ si n’akụrụ ebule. N’ihi na Jehova nwere àjà ọ kwadebere na Bọzra, ọ ga-asụkwa ndị mmadụ akwụ n’ala Idọm.+
17 “Ma gị onwe gị, nwa nke mmadụ, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Gwa ụdị nnụnụ niile na anụ ọhịa niile,+ sị: “Zukọtanụ bịa. Zukọtanụ gburugburu àjà m chụrụ, nke m chụụrụ unu, nnukwu àjà m chụrụ n’elu ugwu ndị dị n’Izrel.+ Unu ga-eri anụ, ṅụọkwa ọbara.+