23 Ndị isi gị dị isi ike, bụrụkwa enyi ndị ohi.+ Onye ọ bụla n’ime ha hụrụ iri ngarị n’anya,+ ha na-achụsokwa onyinye.+ Ha adịghị ekpe nwa na-enweghị nna ikpe ziri ezi; ha adịghịkwa anụrụ ọbụna okwu ikpe nke nwaanyị di ya nwụrụ.+
10 unu erigbula nwaanyị di ya nwụrụ+ ma ọ bụ nwa na-enweghị nna,+ onye mbịarambịa+ ma ọ bụ onye nọ n’ahụhụ,+ unu akpakwala nkata n’obi unu ime ibe unu ihe ọjọọ.’+