21 N’ihi na ọnwụ esiwo na windo anyị bata; ọ batawo n’ụlọ elu anyị ka o gbuchapụ ụmụntakịrị anyị n’okporo ámá, gbuchapụkwa ụmụ okorobịa anyị n’ámá obodo.’+
21 Ya mere, nyefee ụmụ ha n’aka ụnwụ,+ nyefeekwa ha n’aka mma agha;+ ka ndị nwunye ha ghọọ ụmụ nwaanyị gba aka ụmụ na ndị inyom di ha nwụrụ.+ Ka ajọ ọrịa gbuo ndị ikom ha, ka mma agha gbuokwa ụmụ okorobịa ha n’agha.+