25 Ọ bụ ya mere Jehova ji na-eweso ndị ya iwe dị ọkụ, ọ ga-esetịkwa aka ya mee ha ihe wee gbuo ha.+ Ugwu ga-ama jijiji,+ ozu ha ga-adịkwa ka ihe e kpofuru ekpofu n’etiti okporo ámá.+
N’ihi ihe a dum, iwe ya adajụbeghị, kama aka ya ka setịrị esetị.
2 Ha ga-agbasa ha n’okpuru anyanwụ na ọnwa na ìgwè ihe niile dị n’eluigwe bụ́ ndị ha hụrụ n’anya, feekwa ofufe, jesookwa,+ chọọkwa ma kpọọrọ isiala.+ A gaghị achịkọta ha, a gaghịkwa eli ha eli. Ha ga-aghọ nsị anụ n’elu ala.”+
22 “Kwuo, sị, ‘Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Ozu ndị mmadụ ga-adị ka nsị anụ n’elu ala, dịkwa ka ùkwù ọka* onye na-ewe ihe ubi ka gbutusịrị egbutusị n’enweghị onye ga-achịkọta ha.”’”+