-
2 Ndị Eze 23:5Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
-
-
5 O wee mee ka ndị nchụàjà nke chi ala ọzọ kwụsị ọrụ, bụ́ ndị ndị eze Juda nyere ọrụ isure ihe nsure ọkụ n’ebe ndị dị elu n’obodo ndị dị na Juda nakwa n’ebe ndị gbara Jeruselem gburugburu, tinyekwara ndị na-esurere Bel,+ anyanwụ na ọnwa na ìgwè kpakpando nke zodịak na ìgwè ihe niile dị n’eluigwe, ihe nsure ọkụ.+
-
-
Ezikiel 8:16Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
-
-
16 O wee kpọbata m n’ogige nke dị n’ime ụlọ Jehova,+ ma, lee! n’ọnụ ụzọ ụlọ nsọ Jehova, n’agbata ihe owuwu ụzọ mbata na ebe ịchụàjà,+ e nwere ihe dị ka ndị ikom iri abụọ na ise+ ndị gbanyere ụlọ nsọ Jehova azụ+ ma chee ihu n’ebe ọwụwa anyanwụ, ha chere ihu n’ebe ọwụwa anyanwu na-akpọrọ anyanwụ isiala.+
-