29 ka anya gị dịrị+ n’ebe ụlọ a dị abalị na ehihie, n’ebe i kwuru banyere ya, sị, ‘Aha m ga-adị na ya,’+ ka i gee ntị n’ekpere ohu gị chere ihu n’ebe a na-ekpe.+
27 Ha na-asị osisi, ‘Ị bụ nna m,’+ sịkwa nkume, ‘Ọ bụ gị mụrụ m.’ Ma, ọ bụ m ka ha gbakụtara azụ, ha echeghị ihu n’ebe m nọ.+ Mgbe ọdachi dakwasịrị ha, ha ga-asị, ‘Bilie zọpụta anyị!’+
33 Ha wee gbakụta m azụ, ha echeghị ihu n’ebe m nọ;+ ọ bụ ezie na m nọ na-ezi ha ihe, na-ebili n’isi ụtụtụ na-ezi ha ihe, ma ọ dịghị onye n’ime ha gere ntị wee nara ịdọ aka ná ntị.+