-
2 Ndị Eze 23:5Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
-
-
5 O wee mee ka ndị nchụàjà nke chi ala ọzọ kwụsị ọrụ, bụ́ ndị ndị eze Juda nyere ọrụ isure ihe nsure ọkụ n’ebe ndị dị elu n’obodo ndị dị na Juda nakwa n’ebe ndị gbara Jeruselem gburugburu, tinyekwara ndị na-esurere Bel,+ anyanwụ na ọnwa na ìgwè kpakpando nke zodịak na ìgwè ihe niile dị n’eluigwe, ihe nsure ọkụ.+
-
-
Job 31:26Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
-
-
26 Ọ bụrụ na m na-ahụbu ìhè ma o nwuo,
Ma ọ bụ ọnwa dị ebube mgbe ọ na-aga,+
-
Jeremaya 44:17Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
-
-
17 kama anyị ga-eme ihe niile anyị ji ọnụ anyị kwuo,+ ya bụ, isurere ‘eze nwaanyị nke eluigwe’+ ihe nsure ọkụ na ịwụsara ya àjà ihe ọṅụṅụ+ dị nnọọ ka anyị onwe anyị+ na nna nna anyị hà+ na ndị eze anyị+ na ndị isi anyị mere n’obodo ndị dị na Juda nakwa n’okporo ámá ndị dị na Jeruselem, mgbe anyị na-eriju afọ, mgbe ihe dịkwaara anyị mma, anyị ahụghịkwa ọdachi ọ bụla ma ọlị.+
-
-
-