51 Ha ga-erikwa ụmụ anụ ụlọ gị na ihe ala gị mepụtara ruo mgbe e kpochapụrụ gị,+ ha agaghịkwa ahapụrụ gị ọka,* mmanya ọhụrụ ma ọ bụ mmanụ ọ bụla, ụmụ ehi gị ma ọ bụ ụmụ ewu na atụrụ gị ọ bụla, ruo mgbe ha bibiri gị.+
3N’ihi na, lee! ezi Onyenwe anyị,+ bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, na-anapụ Jeruselem+ na Juda ihe na-akwado ha na ihe ha dabeere na ya, bụ́ nri na mmiri,+
21 Ya mere, nyefee ụmụ ha n’aka ụnwụ,+ nyefeekwa ha n’aka mma agha;+ ka ndị nwunye ha ghọọ ụmụ nwaanyị gba aka ụmụ na ndị inyom di ha nwụrụ.+ Ka ajọ ọrịa gbuo ndị ikom ha, ka mma agha gbuokwa ụmụ okorobịa ha n’agha.+