11 “Ugbu a, biko, gwa ndị Juda na ndị bi na Jeruselem, sị, ‘Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Lee, m na-akwadebere unu ọdachi, na-echekwa echiche ime unu ihe.+ Biko, onye ọ bụla n’ime unu hapụ ụzọ ọjọọ ya, meekwanụ ka ụzọ unu na omume unu dị mma.”’”+
3 “N’ihi ya, nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘Lee, m na-eche echiche iwetara ezinụlọ a+ ọdachi+ nke unu na-agaghị agbụrụ isi unu na ya,+ ka unu wee ghara ịdị mpako;+ n’ihi na ọ bụ oge ọdachi.+