3 Otú ọ dị, ndị Ijipt bụ mmadụ,+ ha abụghị Chineke; ịnyịnya ha bụkwa anụ ahụ́,+ ha abụghị mmụọ. Jehova ga-esetịkwa aka ya, onye na-enye aka ga-asụ ngọngọ, onye a na-enyere aka ga-adakwa,+ ha niile ga-ala n’iyi n’otu mgbe.
7 “Nke a bụ ihe Jehova, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, ‘Nke a bụ ihe unu ga-agwa eze Juda, bụ́ onye ziri unu ka unu bịa jụọ m ase:+ “Lee! Ndị agha Fero bụ́ ndị na-abịakwute unu inyere unu aka ga-alaghachi n’ala ha, bụ́ Ijipt.+