Diuterọnọmi 28:65 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 65 Ị gaghịkwa atụsara ahụ́ n’etiti mba ndị ahụ,+ ọbụ ụkwụ gị agaghịkwa enwe ebe izu ike; Jehova ga-eme ka obi na-ama gị jijiji,+ meekwa ka anya gị na-agbachi agbachi,+ meekwa ka mkpụrụ obi gị daa mbà n’ebe ahụ. Job 17:7 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 7 Anya m na-ahụ inyoghi inyoghi n’ihi iru uju,+Ahụ́ m dum dịkwa ka onyinyo. Abụ Ọma 6:7 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 7 Anya m adịkwaghị ahụcha ụzọ n’ihi iru uju,+Ọ kawo nká n’ihi ndị niile na-ebuso m iro.+ Aịzaya 59:10 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 10 Anyị na-asọgharị ìsì ná mgbidi dị ka ndị ìsì, anyị na-asọgharịkwa ìsì dị ka ndị na-enweghị anya.+ Anyị akpọwo ụkwụ n’ihe n’etiti ehihie dị ka à ga-asị na ọ bụ mgbe chi jiri. N’etiti ndị gbasiri ike, anyị dị ka ndị nwụrụ anwụ.+ Abụ Ákwá 2:11 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 11 Anya akpọọla m ebe m na-akwa ákwá.+ Afọ agbarụwo m.+Imeju m awụsarala n’ala dị ka mmiri,+ n’ihi na e bibiwo ada bụ́ ndị m,+N’ihi na ụmụntakịrị na ụmụ na-aṅụ ara na-ada mbà n’ámá obodo.+
65 Ị gaghịkwa atụsara ahụ́ n’etiti mba ndị ahụ,+ ọbụ ụkwụ gị agaghịkwa enwe ebe izu ike; Jehova ga-eme ka obi na-ama gị jijiji,+ meekwa ka anya gị na-agbachi agbachi,+ meekwa ka mkpụrụ obi gị daa mbà n’ebe ahụ.
10 Anyị na-asọgharị ìsì ná mgbidi dị ka ndị ìsì, anyị na-asọgharịkwa ìsì dị ka ndị na-enweghị anya.+ Anyị akpọwo ụkwụ n’ihe n’etiti ehihie dị ka à ga-asị na ọ bụ mgbe chi jiri. N’etiti ndị gbasiri ike, anyị dị ka ndị nwụrụ anwụ.+
11 Anya akpọọla m ebe m na-akwa ákwá.+ Afọ agbarụwo m.+Imeju m awụsarala n’ala dị ka mmiri,+ n’ihi na e bibiwo ada bụ́ ndị m,+N’ihi na ụmụntakịrị na ụmụ na-aṅụ ara na-ada mbà n’ámá obodo.+