17 “Ya mere, kwuo, sị, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “M ga-esikwa n’etiti ndị dị iche iche kpọkọta unu, sikwa n’ala dị iche iche a chụgara unu chịkọta unu, m ga-enyekwa unu ala Izrel.+
12 Ya mere, buo amụma, sị ha, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Lee, m ga-emeghe ili unu.+ M ga-akpọpụtakwa unu n’ili unu, unu ndị m, wee kpọbata unu n’ala Izrel.+