17 “Ya mere, kwuo, sị, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “M ga-esikwa n’etiti ndị dị iche iche kpọkọta unu, sikwa n’ala dị iche iche a chụgara unu chịkọta unu, m ga-enyekwa unu ala Izrel.+
14 M ga-akpọkọta ndị a dọọrọ n’agha n’ime ndị m Izrel.+ Ha ga-ewukwa ebe ndị tọgbọrọ n’efu ma biri n’ime ha,+ kọọ ubi vaịn ma ṅụọ mmanya ha, kọọkwa ubi ma rie mkpụrụ ha.’+