10 Belak wee weso Belam iwe dị ọkụ wee kụọ aka,+ Belak wee gaa n’ihu ịsị Belam: “Ọ bụ ka ị bụọ ndị iro m ọnụ+ mere m ji kpọọ gị, ma, lee! ị gọziwo ha gabiga ókè ugboro atọ a.
11 “Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Kụọ aka+ ma zọsie ụkwụ ike n’ala, sịkwa: “Ewoo!” n’ihi ajọ ihe arụ niile nke ụlọ Izrel,+ n’ihi na ọ bụ mma agha,+ ụnwụ+ na ọrịa na-efe efe ka a ga-eji gbuo ha.+