23 Ha ga-eji ụta na árọ̀.+ Obi tara mba ahụ mmiri, ha agaghị enwe ọmịiko. Olu ha ga-ebigbọ dị ka oké osimiri,+ ha ga-agbara ịnyịnya bịa.+ Ọ haziwo onwe ya n’usoro ibu agha dị ka onye agha ka o wee buso gị agha, gị ada bụ́ Zayọn.”+
8 Ịnyịnya ya na-awụ ọsọ karịa agụ owuru, ha na-akpakwa ike karịa anụ ọhịa wolf+ ndị na-apụta n’anyasị. Ịnyịnya agha ya na-azọsi ụkwụ ike n’ala, ọ bụkwa n’ebe dị anya ka ịnyịnya agha ya si abịa. Ha na-efe ọsọ dị ka ugo nke na-efesi ike+ ịga rie ihe.