36 “Eze ahụ ga-emekwa uche ya, ọ ga-ebulikwa onwe ya elu, meekwa onwe ya ka ọ dị elu karịa chi ọ bụla;+ ọ ga-ekwukwa ihe na-awụ akpata oyi n’ahụ́ megide Chi kasị chi niile.+ Ihe ga-agakwara ya nke ọma ruo mgbe amamikpe ahụ kwụsịrị;+ n’ihi na a ga-eme ihe ahụ e kpebiri.