23 N’ugwu dị elu nke dị n’Izrel ka m ga-adọgharị ya,+ ọ ga-awakwa alaka ma mịa mkpụrụ,+ ghọọkwa osisi sida dị ukwuu.+ Nnụnụ niile ndị nwere ụdị nku ọ bụla ga-ebi n’okpuru ya; ha ga-ebikwa na ndò nke alaka ya.+
21 nke akwụkwọ ya mara mma, nke mkpụrụ ya dịkwa ọtụtụ, nke ihe oriri nke na-ezuru ihe niile dị n’elu ya; nke anụ ọhịa niile bi n’okpuru ya, nke anụ ufe nke eluigwe bikwa n’alaka ya,+