20 Jehova wee gaa n’ihu ịgwa Erọn, sị: “Ị gaghị enwe ihe nketa n’ala ha, ọ dịghịkwa òkè ị ga-enweta n’etiti ha.+ Abụ m òkè gị na ihe nketa gị n’etiti ụmụ Izrel.+
18“Ndị nchụàjà, bụ́ ndị Livaị, ya bụ, ebo Livaị dum, agaghị enweta òkè ma ọ bụ ihe nketa ọ bụla n’Izrel.+ Àjà Jehova nke a na-esure n’ọkụ, bụ́ ihe nketa ya, ka ha ga na-eri.+
14 Ọ bụ naanị ebo Livaị ka ọ na-enyeghị ihe nketa.+ Àjà Jehova bụ́ Chineke Izrel nke a na-esure n’ọkụ+ bụ ihe nketa ha,+ dị nnọọ ka o kwere ha ná nkwa.+
4 Mpaghara ahụ dị nsọ e wepụtara n’ala ahụ ga-abụ nke ndị nchụàjà,+ bụ́ ndị na-eje ozi n’ebe nsọ, ndị na-abịa n’ihu Jehova ijere ya ozi.+ Ọ ga-abụ ebe ha ga-ewu ụlọ, bụrụkwa ebe dị nsọ a ga-arụ ebe nsọ ahụ.