22 N’ikpeazụ, Jehova enwekwaghị ike idi ya n’ihi omume ọjọọ unu, n’ihi ihe arụ unu mere,+ ala unu wee bụrụ ebe a lara n’iyi na ihe ijuanya na ihe a bụrụ ọnụ, n’enweghị onye bi ya, dị ka ọ dị taa.+
11 “Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Kụọ aka+ ma zọsie ụkwụ ike n’ala, sịkwa: “Ewoo!” n’ihi ajọ ihe arụ niile nke ụlọ Izrel,+ n’ihi na ọ bụ mma agha,+ ụnwụ+ na ọrịa na-efe efe ka a ga-eji gbuo ha.+