5 Ọ bụghị n’ihi ezi omume+ gị ma ọ bụ n’ihi na obi gị ziri ezi+ ka i ji abanye inweta ala ha; n’ezie, ọ bụ n’ihi ajọ omume nke mba ndị a ka Jehova bụ́ Chineke gị ji achụpụ ha n’ihu gị,+ nakwa ka e wee mezuo okwu Jehova ṅụụrụ nna nna gị hà, bụ́ Ebreham,+ Aịzik,+ na Jekọb,+ n’iyi.
17 n’ihi na ị ga-ahụ na i bibiri ha, ya bụ, ndị Het na ndị Amọraịt, ndị Kenan na ndị Perizaịt, ndị Haịvaịt na ndị Jibọs,+ dị nnọọ ka Jehova bụ́ Chineke gị nyere gị n’iwu;
5 Ha wee zukọta ma gaa, ya bụ, ndị eze ise nke ndị Amọraịt,+ eze Jeruselem, eze Hibrọn, eze Jamọt, eze Lekish, eze Eglọn, ndị a na ndị agha ha niile, ha wee maa ụlọikwuu imegide Gibiọn na ibuso ya agha.
11 “Ebe ọ bụ na Manase+ eze Juda emewo ihe arụ+ ndị a, o mewo ihe ọjọọ karịa ihe niile ndị Amọraịt+ mere, bụ́ ndị biri n’ebe ahụ tupu ya onwe ya, o wee jiri arụsị ya ndị na-asọ oyi ka nsị mee ka ọbụna Juda mehie.+