6 Ma ọ bụrụ na unu akọọrọ m nrọ ahụ, kọọkwara m isi ya, m ga-enye unu onyinye na ụgwọ ọrụ, kwanyekwara unu ùgwù nke ukwuu.+ Ya mere, kọọrọnụ m nrọ ahụ, kọọkwaranụ m isi ya.”
48 Eze wee mee ka Daniel bụrụ onye ukwu,+ o nyekwara ya ọtụtụ nnukwu onyinye, o mekwara ka ọ bụrụ onye na-achị ógbè Babịlọn dum+ a na-achị achị nakwa prifekt bụ́ onyeisi ndị amamihe niile nke Babịlọn.