20 gị onye mere ihe ịrịba ama, rụọkwa ọrụ ebube dị iche iche n’ala Ijipt, bụ́ ndị a maara ruo taa, ma n’Izrel ma n’etiti ndị mmadụ,+ ka i wee meere onwe gị aha, dị ka ọ dị taa.+
3 Lee ka ihe ịrịba ama ya si dị ukwuu, leekwa ka ihe ebube ọ na-eme si dị ukwuu!+ Alaeze ya bụ alaeze na-adịru mgbe ebighị ebi,+ ọchịchị ya na-adịkwa site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.+
4 ebe ọ bụ na Chineke so na-agba àmà site n’ihe ịrịba ama na ihe ebube na ọrụ dị iche iche dị ike,+ sitekwa n’ikesa+ onyinye dị iche iche nke mmụọ nsọ dị ka uche ya si dị?+