9 “Anọ m na-ele anya ruo mgbe e debegasịrị ocheeze,+ Onye Ochie ahụ+ wee nọdụ ọdụ. Uwe ya na-acha ezigbo ọcha,+ ntutu dị ya n’isi dị ka owú dị ọcha.+ Ocheeze ya bụ ire ọkụ ire ọkụ;+ ụkwụ ya bụ ọkụ na-ere ere.+
13 “Anọ m na-ahụ n’ọhụụ m hụrụ n’abalị, ma, lee! onye yiri nwa nke mmadụ+ nọ na-abịa n’ígwé ojii+ nke eluigwe; ọ banyere n’ebe Onye Ochie ahụ+ nọ, ha wee kpọrọ ya bịa nso n’ihu Onye ahụ.+
12 Jehova, ọ́ bụghị kemgbe ogologo oge gara aga ka ị dị?+ Chineke m, Onye Nsọ m, ị dịghị anwụ anwụ.+ Jehova, i mewo ya ka ọ dịrị maka ikpe ikpe ziri ezi; Oké Nkume,+ ọ bụkwa maka ịdọ aka ná ntị+ ka ị tọrọ ntọala ya.