Ilu 15:8 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 8 Àjà ndị ajọ omume bụ ihe arụ n’anya Jehova,+ ma ekpere ndị ziri ezi bụ ihe na-atọ ya ụtọ.+ Ilu 15:29 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 29 Jehova nọ ndị ajọ omume n’ebe dị anya,+ ma ekpere ndị ezi omume ka ọ na-anụ.+ Daniel 9:23 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 23 Mgbe ị malitere ịrịọ arịrịọ, e ziri m ozi, mụ onwe m abịawokwa ịkọrọ gị ya, n’ihi na ị bụ onye a hụrụ n’anya nke ukwuu.+ N’ihi ya, chebara okwu a echiche,+ ghọtakwa ihe ị hụrụ.
23 Mgbe ị malitere ịrịọ arịrịọ, e ziri m ozi, mụ onwe m abịawokwa ịkọrọ gị ya, n’ihi na ị bụ onye a hụrụ n’anya nke ukwuu.+ N’ihi ya, chebara okwu a echiche,+ ghọtakwa ihe ị hụrụ.