35 A ga-emekwa ka ụfọdụ n’ime ndị nwere nghọta daa,+ ka e wee rụọ ọrụ nnụcha n’ihi ha, meekwa ka ha dị ọcha ma mee ka ha na-enwu gbaa,+ ruo n’oge ikpeazụ;+ n’ihi na ọ ga-abụ n’oge a kara aka.+
3 Ọ ga-anọdụkwa dị ka onye na-anụcha ihe na onye na-eme ka ọlaọcha dị ọcha,+ ọ ga-emekwa ka ụmụ Livaị dị ọcha;+ ọ ga-anụcha ha dị ka ọlaedo,+ nụchaakwa ha dị ka ọlaọcha, ha ga-aghọkwara Jehova ndị na-eweta onyinye inweta ihu ọma+ n’ezi omume.