11 E mesịa, eze Asiria+ dọọrọ Izrel n’agha+ laa Asiria, meekwa ka ha biri na Hela+ nakwa na Hebọ,+ nke dị n’akụkụ osimiri Gozan nakwa n’obodo dị iche iche nke ndị Midia,+
17 “Izrel bụ atụrụ a chụsasịrị achụsasị.+ Ọ bụ ọdụm chụsasịrị ha.+ Eze Asiria ripịara ha na nke mbụ.+ Nebukadreza eze Babịlọn tara ọkpụkpụ ha na nke ikpeazụ a.+
34 “Nebukadreza eze Babịlọn eriela m;+ o tinyewo m n’ọgba aghara. O mewo ka m dịrị ka okpokoro ite. O lowo m dị ka nnukwu agwọ;+ o riwo ihe ọma m rijuo afọ. Ọ ṅachapụwo m.