64 “Jehova ga-achụsasị gị n’etiti ndị niile malite n’otu nsọtụ ụwa ruo na nsọtụ ọzọ nke ụwa,+ n’ebe ahụkwa ka ị ga-efe chi ọzọ ndị ị na-amaghị, ndị gị onwe gị ma ọ bụ nna nna gị hà na-amaghị, bụ́ osisi na nkume.+
15 Ọ ga-erukwa na, dị nnọọ ka okwu ọma niile Jehova bụ́ Chineke unu gwara unu mezuru n’isi unu,+ otú ahụ ka Jehova ga-eme ka ihe ọjọọ niile bịakwasị unu ruo mgbe o kpochapụrụ unu n’ezi ala a nke Jehova bụ́ Chineke unu nyere unu,+
7 m ga-ebipụkwa Izrel n’elu ala ahụ m nyere ha;+ m ga-esikwa n’ihu m tụfuo ụlọ ahụ nke m doro nsọ nye aha m,+ Izrel ga-aghọkwa ihe e ji atụ ilu+ na ihe ịkwa emo n’etiti ndị niile.